Abụ Ọma 6:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 N’ihi na onye nwụrụ anwụ anaghị akpọ aha* gị. Ònye ga-anọli n’ili* too gị?+ Abụ Ọma 115:17 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 Ndị nwụrụ anwụ anaghị eto Jaa.+ Onye ọ bụla nke na-agbada n’ili* anaghịkwa eto ya.+ Ekliziastis 9:10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 10 Ihe ọ bụla i nwere ike ime, jiri ike gị niile mee ya, n’ihi na i nweghị ike ịrụ ọrụ ma ọ bụ ime atụmatụ ma ọ bụ ịmụta ihe ma ọ bụ ịma ihe n’ili,*+ bụ́ ebe ị na-aga.
10 Ihe ọ bụla i nwere ike ime, jiri ike gị niile mee ya, n’ihi na i nweghị ike ịrụ ọrụ ma ọ bụ ime atụmatụ ma ọ bụ ịmụta ihe ma ọ bụ ịma ihe n’ili,*+ bụ́ ebe ị na-aga.