2 Ihe E Mere 16:9 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 9 N’eziokwu, anya Jehova na-ahụzu ụwa niile+ iji gosi ike ya maka* ndị ji obi ha niile* na-efe ya.+ I zuzuru nzuzu n’ihe a i mere. Si ugbu a gawa, a ga na-alụso gị agha.”+ Abụ Ọma 11:4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 4 Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+ Ocheeze Jehova dị n’eluigwe.+ Anya ya na-ahụ ihe niile. Anya ya nke na-ahụ ụzọ nke ọma* na-eleru ndị mmadụ anya.+ Abụ Ọma 17:3 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 3 I nyochaala obi m. I leruola m anya n’abalị.+ Ị nụchaala m.+ Ị ga-achọpụta na e nweghị nkata ọjọọ m kpara,Ejighịkwa m ọnụ m kwuo ihe ọjọọ. Jeremaya 17:10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 10 Mụnwa, bụ́ Jehova, na-enyocha obi,+Na-enyochakwa ihe mmadụ na-eche n’ime ime obi ya,*Iji kwụọ onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà,Kwụọkwa ya ụgwọ ihe ọ rụpụtara.+ Ndị Hibru 4:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 E nweghịkwa ihe e kere eke e zoro ezo n’anya ya,+ kama ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.+
9 N’eziokwu, anya Jehova na-ahụzu ụwa niile+ iji gosi ike ya maka* ndị ji obi ha niile* na-efe ya.+ I zuzuru nzuzu n’ihe a i mere. Si ugbu a gawa, a ga na-alụso gị agha.”+
4 Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+ Ocheeze Jehova dị n’eluigwe.+ Anya ya na-ahụ ihe niile. Anya ya nke na-ahụ ụzọ nke ọma* na-eleru ndị mmadụ anya.+
3 I nyochaala obi m. I leruola m anya n’abalị.+ Ị nụchaala m.+ Ị ga-achọpụta na e nweghị nkata ọjọọ m kpara,Ejighịkwa m ọnụ m kwuo ihe ọjọọ.
10 Mụnwa, bụ́ Jehova, na-enyocha obi,+Na-enyochakwa ihe mmadụ na-eche n’ime ime obi ya,*Iji kwụọ onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà,Kwụọkwa ya ụgwọ ihe ọ rụpụtara.+
13 E nweghịkwa ihe e kere eke e zoro ezo n’anya ya,+ kama ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.+