-
Ọrụ Ndịozi 16:23-25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 Mgbe ha tikachara ha ahụ́, ha kpọchiri ha n’ụlọ mkpọrọ, gwakwa onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ka o chee ha nche ka ha ghara ịgbapụ.+ 24 N’ihi ihe a a gwara ya, ọ kpọchiri ha n’ụlọ mkpọrọ dị n’ime ime ma tụọ ha ọtọsị n’ụkwụ.
25 Ma n’ihe dị ka n’etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ na-ekpe ekpere ma jiri abụ na-eto Chineke.+ Ndị mkpọrọ nọkwa na-anụ olu ha.
-