-
Aịzaya 33:15, 16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe ziri ezi mgbe niile,+
Na-ekwu eziokwu,+
Na-akwụwa aka ọtọ, ghara igwu wayo,
Ghara ịna aka azụ,+
Na-emechi ntị ya ma a kpawa nkata igbu mmadụ,*
Na-emechikwa anya ya ka ọ ghara ịhụ ihe ọjọọ,
16 Ọ ga-ebi n’ebe dị elu.
Ọ bụ na nkume siri ezigbo ike ka ọ ga-agbaba.
Nri agaghị akọ ya.
Mmiri ya agaghịkwa agwụ agwụ.”+
-