20Ma e nwere otu nwoke, bụ́ onye isi ike, aha ya bụ Shiba.+ Ọ bụ nwa Bikraị, onye ebo Benjamin. Ọ fụrụ opi,+ sị: “O nweghị ihe jikọrọ anyị na Devid. O nweghịkwa ihe nwa Jesi+ anyị ga-eketa. Ndị Izrel, onye ọ bụla gaa fewe chi ya!”*+
22 Ozugbo ahụ, nwaanyị ahụ ma ihe gara gwa ndị obodo ya niile, ha egbupụ Shiba nwa Bikraị isi, tụọkwara ya Joab. Ya afụzie opi, ya na ndị agha ya esi n’obodo ahụ lasasịa. Onye ọ bụla n’ime ha lakwara n’ụlọ ya.+ Joab laghachikwukwaara eze na Jeruselem.
22 Eze Solomọn asị nne ya: “Gịnị mere i ji na-arịọ m ka m kpọrọ Abishag nwaanyị Shunem kpọnye Adọnaịja? Rịọkwuonụ m ka m hapụrụ ya ọchịchị+ maka na ọ bụ ya tọrọ m,+ nakwa maka na Abayata onye nchụàjà na Joab+ nwa Zeruya+ na-akwado ya.”
24 Ugbu a, ọ bụ Jehova Chineke dị ndụ mere ka ọchịchị m sie ezigbo ike,+ mee ka m nọrọ n’ocheeze Devid nna m, rụọkwara m ụlọ*+ otú o kwere ná nkwa. Eji m Chineke a na-aṅụ iyi na Adọnaịja ga-anwụrịrị+ taa.”