2 Samuel 12:7 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 7 Netan gwaziri Devid, sị: “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ. Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: ‘Ọ bụ m tere gị mmanụ ka ị bụrụ eze Izrel.+ M napụtakwara gị n’aka Sọl.+ 2 Samuel 12:9 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 9 Gịnị mere i ji leda Jehova* anya, gaa mee ihe ọ sị emela? I gbuola Yuraya onye Het.+ I ji mma agha ndị Amọn gbuo ya,+ kpọrọkwa nwunye ya.+ Abụ Ọma 141:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ pụtara na ọ hụrụ m n’anya.*+ Ọ bụrụ na ọ baara m mba, ọ ga-adị ka ebe a wụsara m mmanụ n’isi.+ A gaghị m ajụ ya.+ M ka ga na-ekpere ya ekpere mgbe ọdachi dakwasịrị ya. Mkpughe 3:19 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 19 “‘Ndị niile m hụrụ n’anya ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị.+ N’ihi ya, chegharịanụ,+ jirikwanụ obi unu niile fewe Chineke.
7 Netan gwaziri Devid, sị: “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ. Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: ‘Ọ bụ m tere gị mmanụ ka ị bụrụ eze Izrel.+ M napụtakwara gị n’aka Sọl.+
9 Gịnị mere i ji leda Jehova* anya, gaa mee ihe ọ sị emela? I gbuola Yuraya onye Het.+ I ji mma agha ndị Amọn gbuo ya,+ kpọrọkwa nwunye ya.+
5 Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ pụtara na ọ hụrụ m n’anya.*+ Ọ bụrụ na ọ baara m mba, ọ ga-adị ka ebe a wụsara m mmanụ n’isi.+ A gaghị m ajụ ya.+ M ka ga na-ekpere ya ekpere mgbe ọdachi dakwasịrị ya.
19 “‘Ndị niile m hụrụ n’anya ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị.+ N’ihi ya, chegharịanụ,+ jirikwanụ obi unu niile fewe Chineke.