2 Abụla onye ọ na-adị ngwa ngwa ikwu okwu, ekwukwala okwu n’ihu ezi Chineke n’echeghị echiche,+ n’ihi na ezi Chineke nọ n’eluigwe, ma ị nọ n’ụwa. Ọ bụ ya mere na i kwesịghị ikwu ọtụtụ okwu.+
19 Ụmụnna m m hụrụ n’anya, maranụ ihe a: Onye ọ bụla kwesịrị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa,+ na onye na-anaghị ewe iwe ngwa ngwa,+