-
Diuterọnọmi 6:10-12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọbata gị n’ala ọ ṅụụrụ nna nna gị hà, bụ́ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi na ọ ga-enye gị,+ bụ́ nnukwu obodo mara mma ndị ọ na-abụghị gị rụrụ,+ 11 ụlọ ndị ụdị ihe ọma dị iche iche juru bụ́ ndị ị na-arụghị ọrụ nweta, olulu mmiri ndị ọ na-abụghị gị gwuru, nakwa ubi vaịn na osisi oliv ndị ọ na-abụghị gị kụrụ, gị erie ihe rijuo afọ,+ 12 lezie anya ka ị ghara ichefu Jehova,+ onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt, n’ebe ị nọ na-agba ohu.*
-