22 M wee hụ na e nweghị ihe dị mma mmadụ ga-eme karịa inwe obi ụtọ+ n’ihi ọrụ ọ na-arụ maka na ọ bụ ya bụ ụgwọ ọrụ ya;* n’ihi na e nweghị onye nwere ike ime ka ọ hụ ihe ga-eme mgbe ọ na-anọghịzi.+
18 Ahụrụ m na ihe a kwesịrị ekwesị ma dị mma: na mmadụ kwesịrị iri ihe, ṅụọ mmanya ma na-enwe obi ụtọ maka ọrụ niile ọ na-arụsi ike+ n’ụwa* n’ụbọchị ole na ole ezi Chineke nyere ya ka o bie ndụ, n’ihi na ọ bụ ya bụ ụgwọ ọrụ ya.*+
9 Ka gị na nwunye gị ị hụrụ n’anya+ kporie ndụ n’ụbọchị niile na-enweghị isi Chineke mere ka ị dị ndụ n’ụwa,* bụ́ ụbọchị niile na-enweghị isi ị dị ndụ, n’ihi na ọ bụ ihe i ketara ná ndụ, bụrụkwa ụgwọ ọrụ gị maka ọrụ ị na-arụsi ike n’ụwa.*+