-
Habakọk 2:18, 19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Olee uru arụsị a pịrị apị bara,
Nke mere onye pịrị ya ji pịa ya?
Olee uru arụsị a kpụrụ akpụ na ụgha ọ na-akụzi bara,
N’agbanyeghị na onye kpụrụ ya tụkwasịrị ya obi,
Onye mere chi ndị na-abaghị uru, ndị na-anaghị ekwu okwu?+
19 Onye na-asị mkpirisi osisi: “Teta,” ga-ata ahụhụ.
Onye na-asịkwa nkume na-enweghị ike ikwu okwu: “Teta, kụziere anyị ihe,” ga-ata ahụhụ.
E ji ọlaedo na ọlaọcha machie ya.+
Ume ndụ ọ bụla adịghịkwa n’ime ya.+
-