6 Ọ sịkwara m: “Ha emezuola. Abụ m Alfa na Omega,* mmalite na ọgwụgwụ.+ M ga-enye onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ mmiri si n’isi iyi mmiri nke ndụ n’efu.+
17 Mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị, “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa, “Bịa!” Onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịa.+ Onye ọ bụla nke chọrọ, ya bịa ṅụọ mmiri nke ndụ n’efu.+