-
Aịzaya 14:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Jehova ga-emere Jekọb ebere,+ họrọkwa Izrel ọzọ.+ Ọ ga-eme ka ha biri* n’ala ha.+ Ndị mbịarambịa ga-agakwurukwa ndị ezinụlọ Jekọb, ha na ha ebiri.+ 2 Ndị obodo dị iche iche ga-edulata ha n’obodo ha. Ndị ezinụlọ Izrel ga-akpọrọkwa ha ka ha bụrụ ndị nwoke na ndị nwaanyị ga na-eje ozi+ n’ala Jehova. Ndị ha na-agbaburu ohu ga na-agbaziri ha ohu, ndị na-amanyebu ha ịrụ ọrụ ga-anọzi n’okpuru ha.
-