-
Diuterọnọmi 30:1-3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
30 “Mgbe okwu a niile ga-emezu n’isi unu, ya bụ, ngọzi na ọbụbụ ọnụ nke m gwara unu ka unu họrọ otu n’ime ha,+ unu echetazie ha+ mgbe unu nọ ná mba niile Jehova bụ́ Chineke unu chụgara unu,+ 2 unu na ụmụ unu ewee jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile+ lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke unu+ ma gewe ntị n’olu ya, mewekwa ihe niile m na-enye unu n’iwu taa, 3 Jehova bụ́ Chineke unu ga-esi n’ebe a dọọrọ unu n’agha kpọlata unu,+ meere unu ebere+ ma si n’ebe niile Jehova bụ́ Chineke unu chụsasịrị unu kpọghachite unu.+
-
-
Aịzaya 66:20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Ha ga-esi ná mba niile jiri ịnyịnya, ụgbọ ịnyịnya, ụgbọala ndị e mechiri elu ha emechi, jakị, na kamel ndị na-awụ ọsọ bute ụmụnne unu niile+ n’ugwu nsọ m, bụ́ Jeruselem, ka ha bụrụ onyinye a ga-enye Jehova, otú ahụ ndị Izrel na-eji arịa dị ọcha ebubata onyinye n’ụlọ Jehova.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
-