-
Daniel 5:18, 19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Eze, Chineke Onye Kacha Elu nyere Nebukadneza nna gị* alaeze a, mee ka ọ bụrụ onye ukwu na onye a na-akwanyere ùgwù na onye a na-asọpụrụ.+ 19 N’ihi otú Chineke si mee ka ọ bụrụ onye ukwu, ndị niile, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche tụrụ ya egwu.+ Ọ na-egbu onye ọ bụla ọ chọrọ igbu, hapụkwa onye ọ bụla ọ chọrọ ịhapụ ndụ. Ọ na-ebuli onye ọ bụla masịrị ya n’ọkwá, wedakwa onye ọ bụla masịrị ya ala.+
-