17 Otu n’ime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, ndị ji efere asaa ahụ,+ wee bịa sị m: “Bịa, m ga-egosi gị ikpe ahụ a mara oké nwaanyị akwụna ahụ nke nọ ọdụ n’elu mmiri na-asọ ike ike,+ 2 onye ya na ndị eze ụwa kwara iko.+ E mekwara ka mmanya ya, nke nọchiri anya iko ọ na-akwa, na-egbu ndị bi n’ụwa.”+