8 Mmụọ ozi nke abụọ wee sochie nke mbụ, sị: “Babịlọn Ukwu ahụ+ adaala! Ọ daala!+ Ọ bụ ya bụ onye mere ka mba niile ṅụọ mmanya ya nke na-eme ka ịkwa iko* gụsiwe ha agụụ ike!”+
3 N’ihi na o meela ka mba niile ṅụọ mmanya ya nke na-eme ka ịkwa iko* gụsiwe ha agụụ ike.+ Ya na ndị eze nke ụwa kwakwara iko.+ Ndụ okomoko ọ na-ebi emeekwala ka ndị ahịa nke ụwa baa ọgaranya.”