2 Ndị Eze 16:8, 9 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Ehaz nyeziri eze Asiria aka azụ.+ O nyere ya ọlaọcha na ọlaedo ndị dị n’ụlọ Jehova nakwa ndị nke dị n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ* eze. 9 Eze Asiria mekwara ihe ọ rịọrọ ya. Ọ gara merie Damaskọs, dọrọ ndị bi na ya n’agha laa Kia,+ gbuokwa Rizin.+ Aịzaya 8:4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 4 n’ihi na tupu nwata ahụ amata otú e si akpọ ‘Papa’ na ‘Mama,’ a ga-ebugara eze Asiria akụ̀ Damaskọs na ihe a kwatara na Sameria.”+ Emọs 1:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 M ga-agbaji ihe e ji atụchi Damaskọs.+ M ga-ebibi ndị bi na Bikat-evin,Bibiekwa onye nọ na Bet-iden na-achị.* A ga-adọrọkwa ndị Siria n’agha laa Kia.”+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’
8 Ehaz nyeziri eze Asiria aka azụ.+ O nyere ya ọlaọcha na ọlaedo ndị dị n’ụlọ Jehova nakwa ndị nke dị n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ* eze. 9 Eze Asiria mekwara ihe ọ rịọrọ ya. Ọ gara merie Damaskọs, dọrọ ndị bi na ya n’agha laa Kia,+ gbuokwa Rizin.+
4 n’ihi na tupu nwata ahụ amata otú e si akpọ ‘Papa’ na ‘Mama,’ a ga-ebugara eze Asiria akụ̀ Damaskọs na ihe a kwatara na Sameria.”+
5 M ga-agbaji ihe e ji atụchi Damaskọs.+ M ga-ebibi ndị bi na Bikat-evin,Bibiekwa onye nọ na Bet-iden na-achị.* A ga-adọrọkwa ndị Siria n’agha laa Kia.”+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’