41 Fero gwakwara Josef, sị: “Lee, m na-eme gị onyeisi n’ala Ijipt niile.”+42 Fero wee gbapụta mgbaaka o ji aka ihe akara gbanye ya Josef n’aka ma yiwe ya ezigbo uwe e ji ákwà linin kpaa, nyawakwa ya ihe olu ọlaedo n’olu.
15 Ma Mọdekaị yiiri uwe onye eze si ebe eze nọ pụọ. E ji ákwà na-acha anụnụ anụnụ na nke na-acha ọcha kwaa uwe ahụ. O kpu nnukwu okpueze ọlaedo, yirikwa uwe mgbokwasị e ji ákwà mara mma na ogho pọpụl kwaa.+ Ndị bi na Shushan* nọkwa na-aṅụrị ezigbo ọṅụ.