-
Ezikiel 26:3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Taya, m ga-eme gị ihe. M ga-akpọta ọtụtụ mba ka ha lụso gị agha, otú ahụ ebili mmiri si eme n’oké osimiri.
-
-
Emọs 1:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Jehova kwukwara, sị:
‘N’ihi isi ndị Taya nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,
N’ihi na ha kpọọrọ ndị niile a dọọrọ n’agha kpọnye Ịdọm,
Nakwa n’ihi na ha echetaghị ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne.+
10 N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa mgbidi Taya.
Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile.’+
-