-
Jeremaya 9:2, 3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 A sị nnọọ na m nwere ebe ndị njem na-arahụ n’ala ịkpa,
M gaara ahapụ ndị obodo m, si ebe ha nọ pụọ,
N’ihi na ha niile na-akwa iko.+
Ha niile na-aghọ aghụghọ.
3 Ha na-adị njikere ịgha ụgha otú onye kwere ụta na-adị njikere ịgbapụ akụ́.
Ihe juru n’obodo a bụ ụgha. E nweghị onye na-akwụwa aka ọtọ.+
Jehova kwuru, sị, “Ha na-esi n’otu ihe ọjọọ gaa n’ihe ọjọọ ọzọ.
Ha ejighịkwa m kpọrọ ihe.”+
-