3 Ọ ga-ekpere ọtụtụ ndị ikpe,+
Doziekwara mba ndị siri ike, ndị dị n’ebe dị anya, okwu ha.
Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,
Kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.+
Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha.
Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.+
4 Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya.+
E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ,+
N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha ekwuola ya.