6 Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkọ n’udo.+
Agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa.
Nwa ehi na ọdụm na anụ gbara agba ga-anọkọkwa.+
Nwatakịrị ga na-edukwa ha.
7 Nne ehi na anụ ọhịa bea ga-atakọ ahịhịa.
Ụmụ ha ga-amakpukọkwa.
Ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka ehi.+