33 M ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche.+ M ga-emekwa ka ndị iro unu jiri mma agha bịa lụso unu agha.+ A ga-eme ka ala unu tọgbọrọ chakoo,+ bibichaakwa obodo unu dị iche iche.
2 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Unu ahụlanụ ọdachi niile m mere ka ọ dakwasị Jeruselem+ na obodo niile dị na Juda. Unu ahụla taa na a laala ha n’iyi. E nweghịkwa onye bi na ha.+