-
Jeremaya 39:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Nebuzaradan onyeisi ndị nche na Nebushazban bụ́ Rabsaris,* na Negal-shariza bụ́ Rabmag* nakwa ndị nwoke niile a ma ama n’ọchịchị eze Babịlọn wee zie ozi, 14 a kpọpụta Jeremaya n’Ogige Ndị Nche,+ nyefee ya n’aka Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan,+ ka ọ kpọrọ ya laa n’ụlọ ya. Otú a ka Jeremaya si biri ebe ndị obodo ya bi.
-
-
Jeremaya 41:2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ahụ ya na ha so biliri jiri mma agha gbuo Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan. Otú a ka ha si gbuo onye eze Babịlọn mere onyeisi ala.
-