-
Jeremaya 44:12-14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 M ga-eme ka ndị fọrọ na Juda, ndị siri ọnwụ na ha ga-aga biri n’Ijipt, laa n’iyi ebe ahụ.+ Mma agha na ụnwụ ga-egbu ha. Mma agha na ụnwụ ga-egbu malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu. Ihe m ga-eme ha ga-eme ka ụjọ tụwa ndị ọzọ. A ga-eji ha na-abụ mmadụ ọnụ. A ga na-eleda ha anya, na-akwakwa ha emo.+ 13 M ga-eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe taa ndị bi n’Ijipt ahụhụ otú ahụ m tara ndị bi na Jeruselem.+ 14 Ihe a ga-emerịrị ndị ahụ fọrọ na Juda, bụ́ ndị gara biri n’Ijipt. Ha agaghịkwa adị ndụ laghachi Juda. Ọ ga-agụsi ha agụụ ike ka ha laghachi birikwa ebe ahụ, ma ha agaghị alaghachili. Ọ gwụla naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ga-alaghachi.’”
-
-
Jeremaya 44:27, 28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Ugbu a, ekpebiela m ime ka ọdachi dakwasị ndị Juda niile fọdụrụ n’Ijipt, ọ bụghị imere ha ihe ọma.+ Mma agha na ụnwụ ga na-egbu ha, ruo mgbe ha nwụchara.+ 28 Naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ga-agbanahụ mma agha, si Ijipt laghachi Juda.+ Ndị Juda niile fọdụrụ, ndị gara biri n’Ijipt, ga-amata onye ihe o kwuru ga-emezu, ma ọ̀ bụ nke m kwuru ka ọ̀ bụ nke ha kwuru.”’”
-