-
Jeremaya 42:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị niile siri ọnwụ na ha ga-aga biri n’Ijipt. E nweghị onye n’ime ha ga-agbanahụ ọdachi m ga-eme ka ọ dakwasị ha. E nweghịkwa onye nke ọ na-agaghị egbu.”’
18 “N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na unu agaa Ijipt, m ga-eji iwe na ọnụma mee unu ihe otú m mere ndị bi na Jeruselem.+ Ihe m ga-eme unu ga-eme ka ụjọ tụwa ndị ọzọ. A ga-ejizi unu na-abụ mmadụ ọnụ. A ga na-eleda unu anya, na-akwakwa unu emo.+ Unu agaghịkwa ahụ ebe a anya ọzọ.’
-