-
2 Ndị Eze 25:8-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 N’abalị asaa n’ọnwa ise, n’afọ nke iri na itoolu n’ọchịchị Nebukadneza eze Babịlọn, Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche, onye na-ejere eze Babịlọn ozi, bịara Jeruselem.+ 9 Ọ gbara ụlọ niile dị na Jeruselem ọkụ,+ ma ụlọ Jehova+ ma ụlọ* eze+ ma ụlọ onye ọ bụla a ma ama.+ 10 Ndị agha Kaldia niile ha na onyeisi ndị nche+ ahụ so bịa kwaturu mgbidi gbara Jeruselem gburugburu.
-
-
2 Ihe E Mere 34:24, 25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi dakwasị obodo a na ndị bi na ya.+ M ga-ata ha ahụhụ niile e dere n’akwụkwọ ahụ+ ha gụrụ n’ihu eze Juda. 25 Ebe ọ bụ na ha ahapụla m+ na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà a na-esu ọkụ, si otú ahụ jiri ihe niile ha ji aka ha rụọ na-akpasu m iwe,+ iwe m ga-ewesa obodo a ga-adị ọkụ. M gaghịkwa akwụsị iwesa ha iwe.’”+
-
-
2 Ihe E Mere 36:16, 17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Ma, ha ji ndị ozi ezi Chineke+ na-eme ihe ọchị. O nweghịkwa ihe ha ji okwu ya kpọrọ.+ Ha nọ na-akwa ndị amụma ya emo+ ruo mgbe hanwa na-akwa emo na-enweghịzi mmekwata. Mgbe ahụzi ka Jehova wesara ha ezigbo iwe.+
17 O mere ka eze ndị Kaldia gaa lụso ha agha,+ jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha+ n’ụlọ nsọ ha.+ O mereghị ma nwa okorobịa ma nwa agbọghọ, ma agadi ma onye na-adịkwaghị ike, ebere.+ Chineke nyefere ihe niile n’aka ya.+
-