43 Ugbu a, Jehova, bụ́ Onye kere Jekọb
Na Onye kpụrụ ununwa bụ́ ndị Izrel,+ kwuru, sị:
“Unu atụla egwu, n’ihi na agbapụtala m unu.+
Akpọrọ m unu aha unu.
Unu bụ ndị nke m.
2 Ọ bụrụ na unu agafewe mmiri, m ga-anọnyere unu.+
Ọ bụrụkwa na unu agafewe osimiri, ọ gaghị eri unu.+
Ọ bụrụ na unu agafewe ebe ọkụ dị, ọ gaghị ere unu,
Ire ọkụ agaghịkwa ere unu.