9 Ihe Chineke kpebiri ime:
“Jehova ekwuola ihe ọ ga-eme ala Hedrak.
Ọ bụ Damaskọs ka ọ ga-eme ya,+
N’ihi na anya Jehova na-ahụ ụmụ mmadụ+
Nakwa ebo niile e nwere n’Izrel.
2 Ọ ga-emekwa ya Hemat,+ nke ya na ya gbara ókè,
Meekwa ya Taya+ na Saịdọn+ n’ihi na ha ma ihe nke ukwuu.+