Aịzaya 30:10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 10 Ha na-asị ndị na-ahụ ọhụụ, ‘Unu ahụzila ọhụụ,’Na-asịkwa ndị amụma, ‘Unu ebuzirila anyị ihe bụ́ eziokwu n’amụma.+ Na-agwanụ anyị ihe ga-atọ anyị ụtọ ịnụ. Na-agwanụ anyị ihe dị mma ná ntị n’agbanyeghị na ọ bụghị ihe unu hụrụ n’ọhụụ.+ Emọs 2:12 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 12 ‘Ma unu nọ na-enye ndị Naziraịt mmanya ka ha ṅụọ.+ Unu nyekwara ndị amụma iwu, sị: “Unu ebula amụma.”+ Emọs 7:16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 Ugbu a, nụrụ ihe Jehova kwuru: ‘Ị na-asị, “Ebula amụma na e nwere ihe a ga-eme Izrel.+ Ekwusakwala na e nwere ihe a ga-eme ezinụlọ Aịzik.”+
10 Ha na-asị ndị na-ahụ ọhụụ, ‘Unu ahụzila ọhụụ,’Na-asịkwa ndị amụma, ‘Unu ebuzirila anyị ihe bụ́ eziokwu n’amụma.+ Na-agwanụ anyị ihe ga-atọ anyị ụtọ ịnụ. Na-agwanụ anyị ihe dị mma ná ntị n’agbanyeghị na ọ bụghị ihe unu hụrụ n’ọhụụ.+
12 ‘Ma unu nọ na-enye ndị Naziraịt mmanya ka ha ṅụọ.+ Unu nyekwara ndị amụma iwu, sị: “Unu ebula amụma.”+
16 Ugbu a, nụrụ ihe Jehova kwuru: ‘Ị na-asị, “Ebula amụma na e nwere ihe a ga-eme Izrel.+ Ekwusakwala na e nwere ihe a ga-eme ezinụlọ Aịzik.”+