15 “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+
25 Jehova ga-eme ka ndị iro unu merie unu.+ Unu ga-esi n’otu ụzọ gaa ịlụso ha agha, ma unu ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu ha. Alaeze niile dị n’ụwa ga-atụ ụjọ mgbe ha ga-ahụ ihe ọjọọ ndị na-eme unu.+
9 M ga-eme ka ọdachi dakwasị ha, ụdị nke ga-eme ka ụjọ tụwa alaeze niile dị n’ụwa.+ Ha ga na-akọcha ha, jiri ha na-ama atụ otú ọdachi na-adị, na-akwakwa ha emo. A ga-abụkwa ha ọnụ+ n’ebe niile m ga-achụga ha.+
46 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘A ga-akpọkọta ndị agha ka ha bịa lụso ha agha. Ha ga-emekwa ha ihe ga-eju ndị mmadụ anya, bukọrọkwa ihe ha.+