3 Jehova bụ́ Chineke unu ga-esi n’ebe a dọọrọ unu n’agha kpọlata unu,+ meere unu ebere+ ma si n’ebe niile Jehova bụ́ Chineke unu chụsasịrị unu kpọghachite unu.+
5 Jehova bụ́ Chineke unu ga-akpọbata unu n’ala nna unu hà biri na ya. Unu ga-ebirikwa na ya. Ọ ga-eme ka ihe gaziere unu, meekwa ka unu mụbaa karịa nna unu hà.+