48 Jehova ga-eme ka ndị iro unu bịa lụso unu agha, unu ga-ejekwara ha ozi.+ N’oge ahụ, agụụ ga na-agụ unu,+ mmiri ga na-agụkwa unu, unu agaghị eyi ezigbo ákwà, ihe niile ga-akọkwa unu. Ọ ga-anyawa unu yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara unu n’iyi.
19 Ọ bụrụkwa na ha ajụọ, sị, ‘Gịnị mere Jehova bụ́ Chineke anyị ji mee anyị ihe a niile?’ ị ga-asị ha, ‘Otú ahụ unu hapụrụ m gaa na-efe chi ndị mba ọzọ n’ala unu, otú ahụ ka unu ga na-ejere ndị mba ọzọ ozi ná mba na-abụghị nke unu.’”+