12 Ọtụtụ n’ime ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị isi ọnụmara dị iche iche, ya bụ, ndị agadi hụrụ ụlọ nke mbụ ahụ,+ bere ákwá n’oké olu mgbe ha hụrụ ka a na-atọ ntọala ụlọ a. Ma, ọtụtụ ndị ọzọ ji oké olu na-eti mkpu ọṅụ.+
17 Ọgbakọ ahụ niile, bụ́ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, wee rụọ ụlọ ndò ma biri n’ụlọ ndò ndị ahụ n’ihi na ndị Izrel emetụbeghị ememme a otú a malite n’oge Joshụa+ nwa Nọn ruo n’ụbọchị ahụ. Ha wee ṅụrịa nnukwu ọṅụ.+