-
Ezikiel 34:11-13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “‘N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ugbu a, m ga-eji aka m chọta atụrụ m, lekọtakwa ha.+ 12 M ga-elekọta atụrụ m otú ahụ onye na-azụ atụrụ si elekọta atụrụ ya ndị gbasasịrị agbasasị ma ọ chọta ha.+ M ga-anapụtakwa ha n’ebe niile a chụsasịrị ha n’ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị.+ 13 M ga-esi ná mba dị iche iche kpọkọta ha, sikwa n’ala dị iche iche chịkọta ha ma kpọlata ha n’ala ha. M ga-azụkwa ha n’ugwu ndị dị n’Izrel,+ n’akụkụ iyi dị iche iche, nakwa n’ebe niile ndị mmadụ bi.
-