-
Jeremaya 49:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 “Ihe a ga-eme Ịdọm ga-eju ndị mmadụ anya.+ Onye ọ bụla nke na-agafe n’obodo a ga-ekporopụ anya na-ele ya, na-afụkwa mkpọrọhịhị n’ihi ahụhụ niile a tara ya. 18 Otú ahụ a na-enweghị onye bi na Sọdọm na Gọmọra na obodo ndị dị ha nso+ mgbe e bibichara ha, ka a na-agaghị enwe onye ọbịa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ga-ebi n’Ịdọm.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
-