-
Ezikiel 40:10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 Ụlọ ndị nche ndị dị n’ọnụ ụzọ ámá, n’ebe ọwụwa anyanwụ, dị atọ n’otu akụkụ, dịrịkwa atọ n’akụkụ nke ọzọ. Ha atọ enweghị nke ka ibe ya. Ogidi ndị dị n’akụkụ ha enweghịkwa nke ka ibe ya.
-
-
Ezikiel 46:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
46 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ọnụ ụzọ ámá nke ogige dị n’ime nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ+ ga-emechi emechi+ ruo ụbọchị isii a na-arụ ọrụ.+ Ma, a ga-emeghe ya n’Ụbọchị Izu Ike, megheekwa ya n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ. 2 Onyeisi ga-esi n’ogige dị ná mpụta bata.+ Ọ ga-esi n’ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá. Ya bata, ya eguzoro n’akụkụ awara ọnụ ụzọ ámá. Ndị nchụàjà ga-achụrụ ya àjà a na-esucha ọkụ na àjà udo, ọ ga-akpọkwa isiala n’ebe e si abata n’ọnụ ụzọ ámá. Ya kpọchaa, ya apụọ. Ma, ọnụ ụzọ ámá ahụ ga-eghere oghe ruo mgbede.
-