-
Ọnụ Ọgụgụ 3:6-8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 “Kpọta ndị si n’ebo Livaị,+ meekwa ka ha guzo n’ihu Erọn onye nchụàjà. Ha ga na-ejere ya ozi.+ 7 Ha ga na-arụrụ Erọn ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ya, na-arụkwara nzukọ Izrel niile ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ha n’ihu ụlọikwuu nzute. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eje ozi dị iche iche gbasara ụlọikwuu. 8 Ha ga na-elekọta arịa niile+ e ji eje ozi n’ụlọikwuu nzute, na-arụkwara ndị Izrel ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ha. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eje ozi dị iche iche gbasara ụlọikwuu ahụ.+
-
-
1 Ihe E Mere 9:22, 23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Ndị niile a họọrọ ka ha na-eche ọnụ ụzọ dị iche iche nche dị narị mmadụ abụọ na iri na abụọ (212). Ha biri n’ime obodo ha dị iche iche n’usoro e si dee aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Devid na Samuel onye ọhụ ụzọ+ họpụtara ha ịrụ ọrụ a a na-enye ndị a tụkwasịrị obi. 23 Ha na ụmụ ha na-ahụ maka iche ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ Jehova nche,+ ya bụ, n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọikwuu.
-