3 Unu akpala àgwà otú ndị Ijipt unu biri n’ala ha na-akpa. Unu emekwala ihe ndị bi na Kenan, bụ́ ebe m na-akpọga unu, na-eme.+ Unu esokwala omenala ha.
16 (N’ihi na unu ma nke ọma otú anyị si bie n’Ijipt nakwa otú anyị si si ná mba dị iche iche gafere mgbe anyị na-apụta.+17 Unu nọkwa na-ahụ chi ha dị iche iche rụrụ arụ na arụsị ha ndị na-asọ oyi,*+ ndị ha ji osisi na nkume nakwa ọlaọcha na ọlaedo mee.)
14 “N’ihi ya, tụọnụ egwu Jehova, na-akpanụ àgwà dị mma,*+ jirikwanụ obi unu niile na-efe ya. Wepụkwanụ chi niile nna nna unu hà fere mgbe ha nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Yufretis nakwa n’Ijipt.+ Na-efekwanụ Jehova.