-
Ọpụpụ 20:8-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 “Cheta Ụbọchị Izu Ike ka i doo ya nsọ.+ 9 Ị ga-eji ụbọchị isii jee ozi ma rụọ ọrụ gị niile.+ 10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike a ga na-edebere Jehova bụ́ Chineke gị. Arụla ọrụ ọ bụla, ma gị ma nwa gị nwoke ma nwa gị nwaanyị ma ohu gị nwoke ma ohu gị nwaanyị ma anụ ụlọ gị ma onye mbịarambịa nọ n’ebe i bi.+
-
-
Levitikọs 25:4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ma n’afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ya ka o zuo ezigbo ike. Ọ bụ afọ izu ike a ga-edebere Jehova. Unu agaghị agha mkpụrụ n’ubi unu ma ọ bụ kwachaa ubi vaịn unu.
-