8 N’egbughị oge, ha ahapụla iwu m nyere ha ka ha na-edebe.+ Ha emeerela onwe ha nwa ehi,* ha na-akpọkwara ya isiala ma na-achụrụ ya àjà, na-asị, ‘Ndị Izrel, ihe a bụ Chi anyị, onye dupụtara anyị n’Ijipt.’”
22 Ma e nweghị otu onye n’ime ndị niile hụrụ ebube m nakwa ọrụ ebube+ ndị m rụrụ* n’Ijipt nakwa n’ala ịkpa ma ka na-anwa m ọnwụnwa+ ugboro iri a, gharakwa ige m ntị,+23 ga-ahụ ala m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na m ga-enye ha. N’eziokwu, e nweghị otu onye n’ime ndị na-akparị m ga-ahụ ya.+