20 Ma, ọ bụrụ na onye ezi omume akwụsị ime ezi omume, mewe ihe ọjọọ,* m ga-eme ka ọdachi dakwasị ya, ọ ga-anwụkwa.+ Ọ bụrụ na ị dọghị ya aka ná ntị, ọ ga-anwụ n’ihi mmehie ya, a gaghịkwa echeta ezi omume o mere, ma, ọbara ya ga-adị gị n’isi.*+
24 “‘Ma, ọ bụrụ na onye ezi omume akwụsị ime ezi omume, mewe ihe ọjọọ, na-akpakwa arụ niile ndị ajọ omume na-akpa, ọ̀ ga-adị ndụ? A gaghịzi echeta nke ọ bụla n’ime ezi omume niile o mere n’oge gara aga.+ Ọ ga-anwụ n’ihi isi o nupụrụ nakwa n’ihi mmehie o mere.+