-
Ndị Hibru 9:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Ma, mgbe Kraịst bịara ka nnukwu onye nchụàjà, o wetara ihe ọma ndị dị ugbu a. Ọ banyekwara n’ụlọikwuu ka ukwuu a na-ejighị aka rụọ, nke kakwa zuo okè, ya bụ, nke na-adịghị n’ụwa a. 12 O jighị ọbara ewu na nke oké ehi banye, kama o ji ọbara nke ya banye n’ebe nsọ ahụ.+ Ọ banyere naanị otu ugboro ma napụta* anyị. Nnapụta a na-adịru ebighị ebi.+
-
-
Ndị Hibru 10:8-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Mgbe o kwuchara, sị: “Ihe ị chọrọ abụghị àjà na onyinye, i nweghịkwa mmasị n’àjà a na-esucha ọkụ nakwa n’àjà mmehie,” ya bụ, àjà ndị Iwu* kwuru ka a na-achụ, 9 o kwuziri, sị: “Lee, abịala m ime uche gị.”+ O wepụrụ ihe nke mbụ ka o wee webata nke abụọ. 10 Ọ bụ “uche”+ Chineke a mere e ji jiri àjà e ji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ naanị otu ugboro mee ka anyị dị nsọ.+
-