6 “Mgbe m hụchara nke ahụ, m nọkwa na-ele anya wee hụ anụ ọhịa ọzọ. O yiri agụ owuru,+ ma o nwere nku anọ n’azụ ya ka nnụnụ. Anụ ọhịa ahụ nwere isi anọ,+ e nyekwara ya ikike ka ọ chịwa.
8 Mkpi ahụ buliri onwe ya elu gafee ókè. Ma ozugbo o siri ike, a gbajiri nnukwu mpi ya. Mpi anọ a na-ahụ nke ọma puliteziri nọchie mpi ahụ. Mpi anọ ahụ chere ihu n’akụkụ anọ nke eluigwe.*+