-
Daniel 4:20-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 “‘Osisi ahụ ị hụrụ, nke toro ezigbo ogologo ma sie ike, nke toruru n’eluigwe, nke a na-anọ n’ebe niile n’ụwa ahụ,+ 21 nke akwụkwọ ya mara mma, nke mkpụrụ ọ mịrị hiri nne, nke nri si na ya na-ezuru ma mmadụ ma anụmanụ, nke anụ ọhịa dị iche iche bi n’okpuru ya, nke nnụnụ dị iche iche bikwa n’alaka ya,+ 22 bụ gị, eze, n’ihi na ị ghọọla onye ukwu ma dị ike. A na-anụ banyere ebube gị n’ebe niile. O ruola n’eluigwe,+ ọchịchị gị eruokwala n’ebe niile n’ụwa.+
-