17Ịlaịja,*+ onye Tishbe, nke dị na Gilied,+ wee sị Ehab: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe,* na-aṅụ iyi na igirigi agaghị ada, mmiri agaghịkwa ezo ruo afọ ole na ole, ọ gwụkwala ma m̀ kwuru ka o zoo.”+
13 Jehova sikwa n’aka ndị amụma ya niile na ndị ọhụụ niile+ na-adọ ndị Izrel na ndị Juda aka ná ntị, sị: “Hapụnụ ihe ọjọọ unu na-eme.+ Na-edebenụ iwu m, na-esonụ ntụziaka m, na-edebekwanụ iwu niile m nyere nna nna unu hà, ndị m gwara ndị amụma, bụ́ ndị ohu m, ka ha gwa unu.”
14 Emọs wee sị Amazaya: “Abụghị m onye amụma na mbụ, abụghịkwa m nwa onye amụma. Kama abụ m onye na-azụ atụrụ+ nakwa onye na-elekọta* mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ. 15 Ma, Jehova si ebe m nọ na-azụ atụrụ kpọrọ m. Jehova gwakwara m, sị, ‘Gaa buoro Izrel bụ́ ndị m amụma.’+