12 M ga-elekọta atụrụ m otú ahụ onye na-azụ atụrụ si elekọta atụrụ ya ndị gbasasịrị agbasasị ma ọ chọta ha.+ M ga-anapụtakwa ha n’ebe niile a chụsasịrị ha n’ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị.+
16 M ga-achọ nke furu efu,+ dughachite nke kpafuru akpafu, kee ọkpụkpụ nke gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ike na-adịghị dị ike. Ma, m ga-ala nke buru ibu na nke dị ike n’iyi. M ga-ekpe ha ikpe, taakwa ha ahụhụ kwesịịrị ha.”
21 “Gwazie ha, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “M ga-esi ná mba dị iche iche ndị Izrel gara kpọpụta ha. M ga-esikwa ebe niile ha nọ kpọkọta ha ma kpọlata ha n’ala ha.+