6 Jehova kwuru, sị: “N’ụbọchị ahụ,
M ga-achịkọta ndị na-ete ụkwụ.
M ga-akpọkọta ndị a chụsasịrị achụsasị,+
Kpọkọtakwa ndị m mesiri ike.
7 M ga-eme ka ndị ahụ na-ete ụkwụ fọdụ,+
Meekwa ka ndị ahụ a chịgara ebe dị anya bụrụ mba dị ike.+
Mụnwa bụ́ Jehova ga-esikwa n’Ugwu Zayọn na-achị ha,
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.