Aịzaya 10:21 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 21 Ọ bụ naanị ndị fọrọnụ,Ya bụ, ndị fọrọ n’ezinụlọ Jekọb, ga-alọghachikwute Chineke bụ́ Dike.+ Maịka 2:12 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 12 Jekọb, m ga-akpọkọta unu niile. O nweghị ihe ga-eme ka m ghara ịkpọkọta ndị Izrel fọdụrụnụ.+ M ga-eme ka ha dịrị n’otu dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ,Dị ka ìgwè anụ nke nọ ebe ha na-ata ahịhịa.+ Ìgwè mmadụ ga na-eme mkpọtụ ebe ahụ.’+ Maịka 7:18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 Olee Chi dị ka gị,Onye na-agbaghara mmehie+ nke ndị fọdụrụ n’Izrel bụ́ ndị ya?+ Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,N’ihi na ịhụnanya* na-atọ ya ụtọ.+
12 Jekọb, m ga-akpọkọta unu niile. O nweghị ihe ga-eme ka m ghara ịkpọkọta ndị Izrel fọdụrụnụ.+ M ga-eme ka ha dịrị n’otu dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ,Dị ka ìgwè anụ nke nọ ebe ha na-ata ahịhịa.+ Ìgwè mmadụ ga na-eme mkpọtụ ebe ahụ.’+
18 Olee Chi dị ka gị,Onye na-agbaghara mmehie+ nke ndị fọdụrụ n’Izrel bụ́ ndị ya?+ Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,N’ihi na ịhụnanya* na-atọ ya ụtọ.+