-
Ezikiel 22:25, 26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Ndị amụma ndị nọ na ya na-agba izu ihe ọjọọ ha ga-eme.+ Ha dị ka ọdụm na-agbọ ụja, nke na-adọgbu anụ.+ Ha na-egbu ndị mmadụ.* Ha nọ na-akpakọba akụ̀ na ihe ndị bara ezigbo uru. Ha emeela ka ọtụtụ ụmụ nwaanyị gbara aka di. 26 Ndị nchụàjà nọ na ya emebiela iwu m.+ Ha na-emerụkwa ebe nsọ m.+ Ha amaghị ihe dị iche n’ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ,+ ha anaghịkwa eme ka ndị mmadụ mata ihe dị iche n’ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha.+ Ha anaghị edebe ụbọchị izu ike m. E nweghịkwa ihe ha ji m kpọrọ.
-